Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:9
23 Iomraidhean Croise  

Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.


Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ.


Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?


Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha.


Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.


“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.


M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?


Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.


Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.


Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”


Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”


“Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.


Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.


Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.


Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.


Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, ha ga-alaghachi nʼIjipt.


Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.


Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.


Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.


Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”


Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan