Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:22 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

22 ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:22
29 Iomraidhean Croise  

Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị.


Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ.


O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.


Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”


“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,


Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.


Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile.


Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.


Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela


Onyenwe anyị bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji.


mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.


Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.


Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.


Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.


Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.


Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.


“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel. “Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ, nke na-adịgide ebighị ebi. E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi, ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ.


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”


Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.


Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche.


Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.


Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ.


Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.


Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.


Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,


Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan