Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:21
26 Iomraidhean Croise  

Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?


Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.


Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.


Kpọpụtanụ ha, bụ ndị ahụ nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, ndị nwere ntị ma ha adịghịkwa anụ ihe.


Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa, nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ, mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.


Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.


“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”


“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.


Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị, na iwu nke Chineke ha.


Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.


Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.


Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.


“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.


“Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt, ma na-agbakwurukwa Asịrịa.


“Ma ha jụrụ ige ntị; ha sitere nʼobiike ha gbakụta m azụ ha, were mkpịsịaka rụchie ntị ha, ka ha ghara ige m ntị.


nke mere na, “ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla, ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’   ”


Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta?


“O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”


“ ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu, “Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla, unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.”


Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ.


Dịka e dere ya, “Chineke nyere ha mmụọ na-eme mmadụ iberiibe. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe; o mere nke a ruo taa.”


Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.


Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.


Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan