Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 5:18 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

18 Ma ọbuná n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-eme ka unu gwusia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 5:18
10 Iomraidhean Croise  

Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’


Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.


“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.


Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.


Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’


Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”


Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara.


Mgbe ha nọ na-egbu ndị mmadụ maọbụ naanị m fọdụrụ, adara m nʼala kpuchie ihu m, tie mkpu akwa, sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Ị ga-esite nʼoke iwe ị na-eweso Jerusalem bibie ihe niile fọdụrụ nʼIzrel?”


Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan