Jeremaya 5:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị. Faic an caibideilBible Nso10 Rigonu n'elu mb͕idi-ya nile, bibie; ma unu emela ka ọ gwusia: wezuganu alaka-ya nile: n'ihi na ọ bughi ihe Jehova nwere ka ha bu. Faic an caibideil |
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”