Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:41 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

41 Ewerewo Keriot, anarawo kwa ebe nile ewusiri ike, obi ndi-dike Moab n'ubọchi ahu gādi kwa ka obi nwanyi ime nēme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:41
16 Iomraidhean Croise  

Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.


Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.


Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?


Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”


“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”


Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.


Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa. Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.


Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ. Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ, ma ọma jijiji ejidela ya. Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike, dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.


Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.


Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha, akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.


Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.


Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.


Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.


Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan