Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:12
14 Iomraidhean Croise  

Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha, tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”


Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.


Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”


Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.


“Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya.


Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.


Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.


“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.


Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.


A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.


Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.


Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan