Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:11
16 Iomraidhean Croise  

Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.


Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela


Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.


Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.


O nweghị onye ọ ga-ahapụ. A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya. Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.


Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.


Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.


Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.


“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.


“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.


E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.


Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.


Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’


ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan