Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 48:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 48:1
19 Iomraidhean Croise  

Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave,


Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa.


“Ugbu a lee, ndị ikom si Amọn, na Moab, na nʼugwu Sia, ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel banye nʼoke ala ha mgbe ha si nʼIjipt pụta, kama ha sitere nʼakụkụ ọzọ gabiga si otu a chebe ndị a ndụ.


Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a, ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha, dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.


Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike, mee ka ha daruo ala, ọ ga-eme ka ha daruo ala, ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.


“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.


Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;


Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.


Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”


“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.


“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,


Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.


na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan