Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 47:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Site n'olu ọzuzọ nke ukwu inyinya-ya nile di ebube, site na nkpọtu ub͕ọ-ala-ya, na ùzù nke wheel-ya nile, ndi bu nna eleghi anya n'azu ilekwasi umu-ha n'ihi aka kudara akuda;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 47:3
14 Iomraidhean Croise  

Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.


Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.


Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.


E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.


Ha ga-eji ngwa agha dị iche iche, ụgbọala nke agha na ọtụtụ igwe ndị mmadụ dị iche iche; ha ji ọta ukwu na ọta nta, kpurukwa okpu agha igwe, were ọnọdụ gburugburu gị nʼakụkụ ọbụla, imegide gị. Aga m enyefe gị nʼaka ha, ka ha taa gị ahụhụ, ha ga-atakwa gị ahụhụ dịka usoro ikpe ha si dị.


Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.


Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.


Ha yikwasịrị onwe ha ihe ikpuchi obi dịka nke e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka ụda nzọ ụkwụ ọtụtụ ịnyịnya nke ụgbọ agha na-esekpu na-abanye nʼọgbọ agha.


Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan