Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 43:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 43:2
31 Iomraidhean Croise  

Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu.


Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel.


Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.


Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi.


Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.


Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”


Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.


Onyenwe anyị kpọrọ ndị nwere obi dị mpako asị. Mara nke a nke ọma: Ha aghaghị ịta ahụhụ.


Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.


Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.


Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.


Isi obodo Ifrem bụ Sameria. Onyeisi Sameria bụ naanị nwa Remalaya. Ọ bụrụ na unu eguzosighị ike nʼokwukwe unu, unu agaghị eguzo ma ọlị.’ ”


Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb ọ ga-adakwasịkwa Izrel.


Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.


Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.”


ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.


Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.


nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.


Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere


na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’


Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.


Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,


“Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị


Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”


Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan