Jeremaya 42:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị. Faic an caibideilBible Nso5 Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme. Faic an caibideil |
“Mgbe ahụ, aga m abịa unu nso ikpe unu ikpe. Aga m abịakwa ngwangwa ịgbagide ha ama bụ ndị mgbaasị, na ndị na-akwa iko, na ndị na-aṅụ iyi ụgha, na ndị na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị na-emegbu ndị na-enweghị nna, na ndị na-anapụ ndị ọbịa ikpe ziri ezi, ndị ahụ niile na-adịghị atụ egwu m.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.