Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 42:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Jeremaia, bú onye-amuma, we si ha, Anuwom; le, m'gaje ikpere Jehova, bú Chineke-unu, ekpere, dika okwu nile nke unu si di; ọ gēru kwa na ihe ọ bula nke Jehova gāza unu, m'gēgosi unu ya; m'gaghi-eb͕ochinari unu ihe ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 42:4
13 Iomraidhean Croise  

Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.


Mosis zara Fero sị ya, “Ngwangwa m si nʼihu gị pụọ, aga m arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Echi, a ga-esite nʼụlọ Fero, na nʼụlọ ndị na-ejere ya ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile wezuga ijiji ndị a. Ọ ga-adị mkpa na Fero ga-elezi anya hapụ ịghọ aghụghọ ọzọ site ịjụ ka ụmụ Izrel gaa chụọrọ Onyenwe anyị aja.”


Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.


Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi.


Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.


Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.


Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha.


Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan