Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 41:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n'akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n'ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 41:9
11 Iomraidhean Croise  

Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’


Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.


Ha wagharịrị nʼọzara na nʼugwu, nʼọgba nkume na nʼọnụ ala. Nʼanya ụwa, a gụrụ ha nʼihe efu.


Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche.


Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.


Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”


Emesịa, ndị ikom Izrel niile, ndị ahụ zoro onwe ha nʼala ugwu ugwu Ifrem pụtara, mgbe ha hụrụ na ndị Filistia na-agba ọsọ. Ha gbapụtara soro ndị ọzọ ịchụ ndị Filistia ọsọ.


Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan