Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 41:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara Ishmel okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Ma achọtara ndikom iri n'etiti ha ndi siri Ishmael, Emela ka ayi nwua: n'ihi na ayi nwere àkù zoro ezo n'ọhia, bú ọka wheat, na ọka barley, na manu, na manu-aṅu. O we rapu, ghara ime ka ha nwua n'etiti umu-nne-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 41:8
9 Iomraidhean Croise  

Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.


Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.


Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.


Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.


Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?


“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan