Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 41:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n'aka-ha, iwebata ya n'ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 41:5
28 Iomraidhean Croise  

Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.


Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.


Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.


Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.


Rehoboam gara Shekem, nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze.


Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.


Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.


Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria.


O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ


Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.


Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.


Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.


Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.


“Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.


Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya,


Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?


A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.


“ ‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel.


Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha.


Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ.


Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.


Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,


Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.


Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.


Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha,


Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan