Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 41:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

16 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n'aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 41:16
4 Iomraidhean Croise  

Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha.


Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.


Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan