Jeremaya 41:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe. Faic an caibideilBible Nso16 Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n'aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata: Faic an caibideil |
Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.