Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 40:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 40:8
29 Iomraidhean Croise  

Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob.


Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.


Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,


Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha.


Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ.


Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa,


Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana,


Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.


Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:


Ndị ikom Netofa, iri ise na isii (56).


Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188),


Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.


Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”


mgbe ahụ ị ga-agwa ha, ‘Anọ m na-arịọ eze arịrịọ ka ọ hapụ izighachi m nʼụlọ Jonatan, ka m nwụọ nʼebe ahụ.’ ”


Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,


Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa


sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.


Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”


Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.


Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,


Mgbe Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ Ishmel nwa Netanaya mere,


Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.


Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere


Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.


Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,


Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.


Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa.


Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan