Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 40:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 Ma mb͕e ọ kālaghachighi, ọ si ya, Ma-ọbu laghachikuru Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye eze Babilon meworo onye-nlekọta obodo nile nke Juda, gi na ya biri n'etiti ndi-gi: ma-ọbu je ebe ọ bula ziri ezi n'anya-gi ije. Onye-isi ndi-ob͕ū we nye ya òkè ihe-oriri na onyinye, zilaga ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 40:5
24 Iomraidhean Croise  

O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,


Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.


O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,


Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị ha, onye mere ka eze kpebie ime ka ụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem dị mma ile anya.


Ezra a si Babilọn bịarute. Ọ bụ onye ọka nʼihe gbasara iwu ahụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Mosis. Eze nyere ya ihe niile nke ọ rịọrọ, nʼihi na aka Onyenwe anyị Chineke ya dịkwasịrị nʼahụ ya.


Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.


Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.


Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.


Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.


Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.


Ma otu ọ dị, Ahikam nwa Shefan, dịnyeere Jeremaya, nʼihi ya a raraghị Jeremaya nye nʼaka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.


ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.


Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”


Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,


nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.


Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.


Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.


Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala.


Ha wetaara anyị ọtụtụ ihe onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nʼije ahụ.


Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan