Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 40:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Jehova we me ka ọ bia, O we me dika O kwuru; n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, ma unu egeghi nti olu-Ya, n'ihi nka ka ihe a ruworo unu aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 40:3
12 Iomraidhean Croise  

“Ma mgbe ihe bidoro ịgara ha nke ọma, ha mekwara ihe jọrọ njọ nʼihu gị. Ọzọkwa, i nyefere ha nʼaka ndị iro ha ka ndị iro ha merie ha. Ma mgbe ọbụla ndị gị chegharịkwutere gị, kpọkuo gị ka i nyere ha aka, ị na-anụ arịrịọ ha, sitekwa nʼobi ebere gị gbapụta ha.


Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.


Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.


“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’


“Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.


Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”


Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’


Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.


Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi.


Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.


Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan