Jeremaya 40:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ. Faic an caibideilBible Nso12 ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku. Faic an caibideil |
Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.