Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:30 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

30 Ma gi onwe-gi, mb͕e ebibiworo gi, gini ka i gēme? Mb͕e i geyi uwe uhie, mb͕e i gēke ihe-ichọ-nma ọla-edo, mb͕e i gēji ihe-ichọ-nma me ka anya-gi abua sa mbara, n'efu ka i nēme onwe-gi ka i ma nma; ndi-iko-gi ajuwo gi, ndu-gi ka ha nāchọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:30
27 Iomraidhean Croise  

Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.


Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.


Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.


Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?


Nʼụbọchị ahụ, ndị ahụ dịnyeere ha, bụ ndị bi nʼọnụ mmiri ha ga-asị, ‘Ọ bụrụ na ihe dị otu a dakwasịrị ndị Ijipt anyị tụkwasịrị obi inyere anyị aka, na ịnapụta anyị site nʼaka eze Asịrịa, ebeekwanụ ka anyị ga-agbaga?’ ”


Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”


Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?


Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.


Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.


Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”


“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.


Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.


Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.


Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.


Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.


Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.


Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.


Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.


Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”


Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan