Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:21
11 Iomraidhean Croise  

Jeremaya bụụrụ Josaya abụ akwa, ruo taa ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ a iji na-echeta Josaya. Nke a ghọrọ omenaala nʼIzrel, e dekwara ya nʼakwụkwọ abụ akwa dị iche iche.


Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.


Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza.


Eze Ijipt chụdara ya site nʼọchịchị na Jerusalem, kwagide ndị Juda ka ha tụọra ya ụtụ narị talenti ọlaọcha na otu talenti ọlaedo.


Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.


Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.


“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”


ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’


“Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin! Sitenụ na Jerusalem gbapụ! Gbuonụ opi ike na Tekoa! Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem! Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa, e, mbibi dị ukwuu na-abịa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan