Jeremaya 4:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. Faic an caibideilBible Nso16 hotaranu mba nile; le, menu ka anuru ya megide Jerusalem, si, na ndi-nche nābia site n'ala di anya, ha we me ka olu-ha da megide obodo nile nke Juda. Faic an caibideil |
Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya; bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya. Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị, ‘A ga-adọta Babilọn nʼagha. Ihere ga-emesịa mee Bel; otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi. A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ; oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’