Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 4:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ezie I rafuwo ndi nka na Jerusalem nke-uku, si, Udo gādiri unu, ma mma-agha emetuwo nkpuru-obi aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 4:10
21 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?


Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile.


Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.


“Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.”


Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eme ka anyị si nʼụzọ gị kpafuo na-eme ka obi anyị sie ike otu a, na anyị adịghị atụ egwu gị? Lọghachi nʼihi ndị ohu gị, nʼihi ebo ndị ahụ bụ ihe nketa gị.


Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.”


Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’


“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime.


“Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”


Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.


Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.


Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.


“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.


Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”


Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha.


Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi.


Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan