Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 39:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 O rue, mb͕e Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-agha nile huru ha, na ha b͕alagara, were abali si n'obodo ahu pua, n'uzọ ubi eze ab͕ara ogige, n'ọnu-uzọ-ama nke di n'etiti mb͕idi abua: o we pua ga n'uzọ Araba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 39:4
17 Iomraidhean Croise  

Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.


Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.


Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.


Ma aga m akpagbu Ariel, ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa, ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.


Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn,


onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”


“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.


Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.


Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.


“ ‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.


Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.


Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan