Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 39:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 39:3
6 Iomraidhean Croise  

Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima.


Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda.


‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.


Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.


Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,


Ịnyịnya ya ga-adị ọtụtụ nke ga-eme ka ha jiri uzuzu kpuchie gị. Mgbidi gị ga-ama jijiji nʼihi oke ụzụ nke ịnyịnya agha ndị a, na ụgbọ agha, na wagọn ịnyịnya na-adọkpụ ga-eme, mgbe ha na-abata nʼọnụ ụzọ ama gị, dị ka mgbe ọtụtụ mmadụ na-abanye nʼime obodo e tidara mgbidi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan