Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 39:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 Were ya, ka anya-gi abua di n'aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 39:12
12 Iomraidhean Croise  

Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.


Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị, nke ọ na-ahazi nʼụzọ ọbụla dị ya mma.


Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.


Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.


“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”


Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.


Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,


Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”


Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”


zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan