Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 39:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 (n'arọ nke-iteghete nke Zedekaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iri, ka Nebukadreza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, biaruru Jerusalem, we nọchigide ya n'agha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 39:1
16 Iomraidhean Croise  

Ya mere, o welitara eze Kaldịa imegide ha, bụ onye ji mma agha gbuchapụ ụmụ okorobịa ha nʼụlọ ebe nsọ ha. O nweghịkwa ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa, maọbụ ụmụ agbọghọ dị, ndị okenye maọbụ ndị nrịa nrịa. Chineke weere ha niile nyefee ha nʼaka Nebukadneza.


Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza.


Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,


Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’


Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna.


Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.


O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.”


Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel.


Nʼafọ nke iri abụọ na ise nke e mere ka anyị biri na mba ọzọ, na mbido afọ ahụ, nʼụbọchị nke iri, nke ọnwa ahụ nʼafọ nke iri na anọ site na mgbe obodo ahụ dara, nʼotu ụbọchị ahụ ka aka Onyenwe anyị dịkwasịrị m nʼahụ. O mere ka m bịa nʼebe ahụ.


Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”


Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan