Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 38:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 38:4
25 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ, Ehab jụrụ Ịlaịja ajụjụ sị ya, “Onye iro m, ị chọrọkwala m bịa?” Ịlaịja zara sị ya, “E, achọrọla m gị bịa nʼihi nnyefe i nyefere onwe gị ime ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.


Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.


Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.


Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”


Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”


Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”


Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.


Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”


Chọọnụ udo nke obodo ahụ m mere ka unu gaa biri nʼime ya. Kpeekwanụ ekpere nye Onyenwe anyị banyere ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ihe agaara obodo ahụ nke ọma, ọ ga-agakwara unu nke ọma.”


Ma Zedekaya bụ eze ṅụrụ iyi na nzuzo nye Jeremaya sị ya, “Dịka Onyenwe anyị onye nyere anyị ume anyị na-eku si adị ndụ, agaghị m egbu gị, maọbụ nyefee gị nʼaka ndị na-achọsi ndụ gị ike.”


Ọ bụrụ na ndịisi ọchịchị anụ na mụ na gị kparịtara ụka, ha bịakwute gị, sị gị, ‘Gwa anyị ihe ị gwara eze na ihe eze gwara gị, ezola ihe ọbụla nʼebe anyị nọ, ma ọ bụghị ya anyị ga-egbu gị,’


Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”


Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha.


Mgbe ahụ, Amazaya onye nchụaja nọ na Betel zigaara Jeroboam bụ eze Izrel ozi na-asị, “Emọs na-akwalị izu nzuzo ka ọ megide gị nʼetiti ụlọ Izrel, ala apụghị ibu okwu niile sị ya nʼọnụ apụta.


Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”


Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,


Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.


“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.


Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan