Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n'Anatot: n'ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:7
15 Iomraidhean Croise  

Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”


Ndị a bụ okwu Jeremaya nwa Hilkaya, bụ otu onye nʼime ndị nchụaja, nọ nʼAnatot nke dị nʼala Benjamin.


Ya mere, nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị Anatot ahụ na-achọ ịnapụ gị ndụ gị, ndị ahụ na-asị gị, “Ebukwala amụma site nʼaha Onyenwe anyị ka ị ghara ịnwụ nʼaka anyị.”


Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,


“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’ “Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị.


“ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m.


Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.


“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.


Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.


Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.


“Nye ndị Izrel iwu ka ha nye ndị Livayị ụfọdụ obodo ebe ha ga-ebi. Obodo ndị a ga-abụ ndị si nʼihe nketa ndị Izrel ketara. Nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ na-akpa nri, nke ga-agba obodo ndị a gburugburu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan