Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:5
20 Iomraidhean Croise  

Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”


Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”


O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.


Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.


‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”


“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.


Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,


nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.


A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”


Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.


Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.


Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.


“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.


“Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.


Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.


Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?


Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan