Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 32:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 32:3
23 Iomraidhean Croise  

Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.


Eze Ijipt zara ha sị, “Mosis na Erọn, gịnị mere unu ji na-ewepụ ụmụ Izrel aka site nʼọrụ ha? Laghachinụ nʼọrụ unu!”


“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu.


Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,


“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


“Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha.


Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”


Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.


Ma ọ bụrụ na ị jụ iwere onwe gị nyefee nʼaka ndịisi eze Babilọn, a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn. Ha ga-akpọkwa ya ọkụ, ma gị onwe gị agakwaghị agbapụ site nʼaka ha.’ ”


Ihe ndị a kwa ka Onyenwe anyị kwuru, ‘A ga-arara obodo a nyefee ya nʼaka ndị agha eze Babilọn, onye ga-adọta ya nʼagha.’ ”


Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”


Ebed-Melek si nʼụlọeze pụọ jekwuuru ya nʼebe ahụ sị ya,


Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.


“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.


Ebula amụma ọzọ na Betel, nʼihi na ọ bụ ebe nsọ nke eze, ọ bụkwa ụlọnsọ ukwu nke alaeze ya.”


Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan