Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 30:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M'gēme ka o biliere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 30:9
14 Iomraidhean Croise  

O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?


“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.


Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu,” ka Onyenwe anyị kwubiri, “echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.


Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, maka ịbịaru m nso?’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


“ ‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.


Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.


na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”


O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.


“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite.


Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru, “ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’


Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan