Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:19 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

19 Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:19
32 Iomraidhean Croise  

Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.


Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.


Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’


Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.


Ma gị onwe gị, bụ Nna anyị, a sịkwarị na Ebraham amaghị anyị maọbụ Izrel agọnarị anyị, gị onwe gị, Onyenwe anyị, bụ Nna anyị, onye Mgbapụta anyị ka ị na-azakwa siterị na mgbe ochie.


Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị. Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite. Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.


Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.


Mgbe oge ahụ ruru, aha a ga-akpọ Jerusalem bụ Ocheeze Onyenwe anyị. Mba niile kwa ga-ezukọta nʼebe ahụ ife m ofufe. Ha agakwaghị agbaso echiche obi ọjọọ ha.


Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.


Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.


Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’


“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.


Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.


Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya.


Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya.


Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.


Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ


“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem? M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel? M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma? M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim? Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m; ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.


Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs.


O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.


Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.


Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.


Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan