Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:18 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nʼụbọchị ahụ ndị Juda ga-adịnyere ndị Izrel, ha abụọ ga-ejikọta aka site nʼala ahụ dị nʼugwu bịa nʼala nke m nyere nna nna unu dịka ihe nketa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

18 N'ubọchi ahu ulo Juda gējekuru ulo Israel, ha gāyikọ kwa bia site n'ala Ugwu rue ala ahu nke M'mere ka nna-unu-hà keta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:18
22 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị mere ka Ebram hụ ya anya, ọ sịrị, “Aga m enye mkpụrụ gị ala a.” Ya mere, Ebram wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ nye Onyenwe anyị onye gosiri ya onwe ya.


Atụla egwu nʼihi na anọnyeere m gị. Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ chịkọtaa ụmụ gị.


Aga m enyekwa ugwu na ndịda iwu sị ha, ‘Hapụnụ ha ka ha laa, unu egbochikwala ha.’ Hapụnụ ndị m ka ha site nʼala niile dị anya nke nsọtụ ụwa lọghachi,


Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.


ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”


Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.


Nʼihi na ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-akpọghachite ndị m bụ Izrel na Juda si nʼebe e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọta. Aga m eme ka ha laghachi nʼala ahụ m nyere nna nna ha, ka ha nwetakwa ya.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.”


Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!


Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel, ma ọ dịghị nke a ga-achọta. A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda, ma o nweghị nke a ga-achọta, nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.


“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.


Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn. Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ. Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee nʼaka Onyenwe anyị, nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.


mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi.


“Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’


A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ.


Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu, ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume, ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ, ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.


“Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya, nʼihi na ọ bụghị nwunye m, mụ onwe m abụkwaghị di ya. Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya, ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ.


Aga m akụ Izrel nʼala ha. A gaghị ehopukwa ha ọzọ site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.


“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.


“Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan