Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 3:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 3:13
22 Iomraidhean Croise  

Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha.


Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.


Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla. Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.


Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a, “Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu. Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe. Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ. Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha, ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”


Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.


“Nʼoge gara aga, unu gbajiri yoku unu dọkapụ agbụ jikọtara mụ na unu, unu sịrị, ‘Agaghị m ejere gị ozi.’ Nʼezie, ọ bụ nʼelu ugwu ọbụla nakwa nʼokpuru osisi na-agbasa agbasa, ka ị na-edina dịka onye akwụna.


Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’


“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.


Ka anyị dinara ala nʼihere anyị, ka ọnọdụ oke ihere dịrị anyị kpuchikwa anyị. Anyị na nna nna anyị ha emehiela megide Onyenwe anyị Chineke anyị; site mgbe anyị dị na nwantakịrị ruo taa o nwebeghị mgbe anyị ji rube isi ime ihe Onyenwe anyị Chineke anyị nyere nʼiwu.”


Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.


Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.


Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’


“ ‘Ma ị tụkwasịrị mma gị obi, jiri nʼihi na a mara aha gị ghọọ onye akwụna. I wekwaara onwe gị nye nwoke ọbụla gabigara mee ka mma gị bụrụ nke ya.


Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, ma chọọ ihu m; nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, ha ga-achọsi m ike.”


Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan