Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 27:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 27:8
15 Iomraidhean Croise  

Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’ ”


Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.


Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”


Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ”


Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.


Aga m eji mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, chụọ ha ọsọ. Aga m eme ha ka ha bụrụ ihe alaeze niile nke ụwa ga na-asọ oyi. Ha ga-abụ ihe ịbụ ọnụ, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe ịta ụta nʼetiti mba niile ebe m ga-achụla ha ọsọ.


Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.


“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan