Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 27:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m'gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 27:12
11 Iomraidhean Croise  

Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”


Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”


Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.


“ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m.


“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn.


Mgbe ahụ, Jeremaya zara Zedekaya sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na ị pụkwuru ndịisi eze Babilọn nyefee onwe gị nʼaka ha, ha ga-echebe gị ndụ, ha agakwaghị akpọ obodo a ọkụ. Gị na ezinaụlọ gị ga-adịkwa ndụ.


Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan