Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 26:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 26:9
28 Iomraidhean Croise  

Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?” Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.”


bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara, ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya, ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.


Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.


“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa


Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”


“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”


Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.


Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị, na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.


Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.”


Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?”


Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya.


Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.


Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.


Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.


Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ.


Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile.


Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”


Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn.


Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn.


sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”


Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”


Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan