Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 26:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị),

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 26:5
20 Iomraidhean Croise  

Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.”


tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.


Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya.


Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.


nke i ji dọọ anyị aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma, bụ ndị ohu gị. Nʼihi na i si nʼọnụ ha kwuo sị, ‘Ala ahụ unu na-abanye inweta bụ ala nke ndị bi nʼime ya mere ka ọ rụọ arụ. Nʼihi na ndị bi nʼime ya esitela nʼomume ọjọọ ha mee ka akụkụ ala ahụ niile rụọ arụ.


Site nʼoge ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha ruo taa, adọọla m unu aka na ntị mgbe mgbe sị, “Ruberenụ m isi.”


Nʼihi na ha egeghị ntị nʼokwu m, bụ okwu si nʼọnụ ndị ohu m bụ ndị amụma, ndị m zigaara ha mgbe mgbe. Ma unu onwe unu, ndị bi na mba ọzọ egekwaghị ntị nʼokwu m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Ha gbakụtara m azụ, jụ ilenye anya nʼebe m nọ. Ọ bụ ezie na m ziri ha ihe mgbe mgbe, ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ịnabata ịdọ aka na ntị m.


Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”


Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’


Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.


Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m.


“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m.


Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.


Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”


Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma.


Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan