Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 26:22 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

22 Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n'Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 26:22
10 Iomraidhean Croise  

Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.


O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha,


Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.


Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.


Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.


Onye Jeremaya nyere akwụkwọ ozi a ka o nyeruo ndị e deere ya bụ Eleasa nwa Shefan, na Gemaraya nwa Hilkaya, ndị Zedekaya eze Juda zigara Babilọn izi Nebukadneza bụ eze ozi.


o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.


Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.


ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.


Nʼihu ihe ndị a, ka iri ndị okenye asaa nke ụlọ Izrel, ha na Jaazanaya nwa Shefan guzo nʼebe ahụ. Onye ọbụla nʼime ha ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼaka ya, anwụrụ ọkụ si nʼihe nsure ọkụ ndị a na-agbagokwa elu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan