Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 26:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 26:11
13 Iomraidhean Croise  

Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị, maara nzube ọjọọ ha niile igbu m. Agbagharala ha ajọ omume ha; maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị. Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị; mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.


Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ ahụ niile gwara ndị nchụaja na ndị amụma okwu sị ha, “O kwesighị ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ nʼihi na ọ gwara anyị okwu site nʼaha Onyenwe anyị Chineke anyị.”


Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị sịrị eze, “O kwesiri ka e gbuo nwoke a, nʼihi na ọ na-eme ka obi ndị agha na obi ndị mmadụ fọdụrụ nʼime obodo a na-ada mba site nʼụdị okwu ọ na-agwa ha. Ọ bụghị ọdịmma ndị a ka ọ na-eche echiche ya, kama ọ bụ otu ha ga-esi laa nʼiyi.”


Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”


Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.”


Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.”


Ha ṅara ya ntị ruo ugbu a. Mgbe ahụ, ha niile tiri mkpu nʼotu olu sị, “Wepụnụ onye dị otu a nʼụwa! O kwesighị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”


Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”


Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan