Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 24:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

6 N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 24:6
28 Iomraidhean Croise  

“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’


Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.”


Chineke m biko, echefula ihe m meere ndị a, gọzie m nʼụzọ nke gị.


Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;


I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.


Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.


Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.


Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”


Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile.


Ma a ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọpụtara Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba ahụ niile ọ chụsara ha.’ Nʼihi na aga m akpọlata ha nʼala ahụ m nyere nna nna ha.


Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’


“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Mgbe iri afọ asaa m kwadoro maka Babilọn zuru, aga m abịa mezuo nkwa ahụ m kwere. Aga m eme ka unu lọtakwa nʼebe a.


Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.


Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo.


Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.


Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.


Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’


“Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”


‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu.


“ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu.


Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta. “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.


Ọ bụ ala nke Onyenwe anyị Chineke unu nʼonwe ya na-elekọta! Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, sitekwa na mbido afọ ruo nʼọgwụgwụ afọ, anya ya adịghị apụ na ya.


Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha, ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan