Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.