Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 24:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Jehova we sim, Gini ka onwe-gi nāhu, Jeremaia? M'we si, Fig; ndi bu ezi fig di nma nke-uku; ma ndi bu fig ọjọ jọrọ njọ nke-uku, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 24:3
10 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,


E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m eziga mma agha nʼetiti ha, zigakwa ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Aga m eme ha ka ha dị ka mkpụrụ fiig jọgburu onwe ya, nke mmadụ na-agaghị ata ata.


Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.


Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”


Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha.


Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m, “Ahụrụ m akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ nke na-efegharị efegharị. Ogologo ya dị mita iri, obosara ya dịkwa mita ise.”


(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan