Jeremaya 24:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’ ” Faic an caibideilBible Nso10 M'gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n'elu ala ahu nke M'nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha. Faic an caibideil |
Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.