Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M'gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:2
21 Iomraidhean Croise  

Ma ugbu a, duru ndị a gaa ebe ahụ m gwara gị. Mmụọ ozi m ga-edu unu nʼije a. Ma otu ọ dị, mgbe m bịara ileta ndị a, aga m ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”


Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.


Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom.


Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.


Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?


Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?


“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”


Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.


Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.


Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.


M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?


Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”


Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.


Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.


Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile, ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya, pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.


Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.


“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.


nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile.


Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’


Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’


Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan