Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 22:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 22:9
16 Iomraidhean Croise  

Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’


Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na arụsị niile nke aka ha mepụtara. Iwe m ga-adị ọkụ megide ebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’


Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’


Ha alaghachila azụ nʼụdị mmehie ahụ nna nna ha mehiere, bụ ndị ahụ jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha agbasoola chi ndị ọzọ na-efe ha. Ụlọ Izrel na ụlọ Juda adịghị edebekwa ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara.


Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,


Mgbe ahụ, ị ga-asa ha sị ha, ‘Ihe ndị a na-adakwasị unu nʼihi na nna nna unu ha gbakụtara m azụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘gbasoro, fee ma kpọọkwa isiala nye chi ndị ọzọ. Ha jụrụ iso m, jụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu.


Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’


Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.


Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”


A ga-akasịkwa unu obi mgbe unu hụrụ omume ha na obibi ndụ ha, unu ga-amatakwa na ọ bụghị nʼefu ka m mere ka ihe ndị a niile dakwasị ha.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.


Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.


Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.


Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan