Jeremaya 22:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Faic an caibideilBible Nso6 N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi. Faic an caibideil |
I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, ‘Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ ya kachasị nʼịdị elu, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
“Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi. Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’